ỌPUPU 34:23-24
ỌPUPU 34:23-24 Bible Nso (IGBOB)
Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel. N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 34ỌPUPU 34:23-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị nke Izrel. Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu ONYENWE ANYị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 34