ỌPUPU 32:1-4
ỌPUPU 32:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya. Eron we si ha, Tijipunu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti nke nwunye-unu, na nke umu-unu ndikom, na nke umu-unu ndinyom, chitaram ha. Ndi ahu nile we tijipu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti-ha, chitara ha Eron. Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
ỌPUPU 32:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ na Mosis anọọla ọdụ ịrịdata site nʼelu ugwu Saịnaị, ha zukọtara, bịakwute Erọn, sị ya, “Bilie, meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.” Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.” Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn. Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”