ỌPUPU 30:23-25
ỌPUPU 30:23-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ, na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị. Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ.
ỌPUPU 30:23-25 Bible Nso (IGBOB)
Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin: i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.