ỌPUPU 30:17-21
ỌPUPU 30:17-21 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu. Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya: mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.
ỌPUPU 30:17-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọzọkwa, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja. Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya. Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu ONYENWE ANYị site nʼọkụ, ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”