ỌPUPU 3:10-12
ỌPUPU 3:10-12 Bible Nso (IGBOB)
Ub͕u a kwa, bia, M'gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n'Ijipt puta. Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m'bu, na m'gējekuru Fero, na m'gēme kwa ka umu Israel si n'Ijipt puta? Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 3ỌPUPU 3:10-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.” Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?” Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 3