Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 3:1-8

ỌPUPU 3:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke. Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke ONYENWE ANYị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ. Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.” Mgbe ONYENWE ANYị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.” Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya. Mgbe ahụ ONYENWE ANYị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga. Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.