ỌPUPU 22:16-31
ỌPUPU 22:16-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya. Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. “E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ. “Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ. “Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị, a ga-eme ka ọ nwụọ. “Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt. “Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna. “Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa. Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara. Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere. “Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ. “Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ. “Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ. Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa. “Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.
ỌPUPU 22:16-31 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya. Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di. Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu. Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua. Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya. Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt. Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala. Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya; iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei. Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma. Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya: n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu. Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu. Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem. Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem. Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.