ỌPUPU 2:5-10
ỌPUPU 2:5-10 Bible Nso (IGBOB)
Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya. O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu. Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara? Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu. Nwa-nwayi Fero we si ya, Kuru nwa nka la, nyerem ya ara, mu onwem gēnye kwa gi ugwọ-ọlu-gi. Nwayi ahu we kuru nwa ahu, nye ya ara. Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N'ihi na nime miri ka m'dọputara ya.
ỌPUPU 2:5-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.” Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”