ỌPUPU 2:23-25
ỌPUPU 2:23-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị. Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara. Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 2ỌPUPU 2:23-25 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu. Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara. Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 2