ỌPUPU 19:1-8
ỌPUPU 19:1-8 Bible Nso (IGBOB)
N'ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n'ala Ijipt, n'ubọchi ahu ka ha batara n'ọzara Sainai. Ha we si na Refidim bulie ije, bata n'ọzara Sainai, we ma ulo-ikwū-ha n'ọzara ahu; Israel we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'iru ugwu ahu. Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel; Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem. Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile: unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel. Moses we bia, kpọ ndi-okenye ndi Israel, tiye okwu ndia nile n'iru ha, bú nke Jehova nyere ya n'iwu. Ndi Israel nile we za n'otù, si, Ihe nile Jehova kwuru, ayi gēme ya. Moses we weghachiri Jehova okwu nile nke ndi ahu.
ỌPUPU 19:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.” Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke ONYENWE ANYị nyere ya nʼiwu. Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla ONYENWE ANYị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara ONYENWE ANYị ihe niile ndị Izrel kwuru.