ỌPUPU 18:14-19
ỌPUPU 18:14-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?” Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke. Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.” Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma. Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya. Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
ỌPUPU 18:14-19 Bible Nso (IGBOB)
Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi? Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase: mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile. Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme. I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n'ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche. Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile