ỌPUPU 14:1-14
ỌPUPU 14:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis, “Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’ Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ. Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?” Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha. Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile. ONYENWE ANYị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba. Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn. Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo ONYENWE ANYị. Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt? Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.” Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube ONYENWE ANYị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ. Nọrọnụ jii. ONYENWE ANYị ga-alụrụ unu ọgụ.”
ỌPUPU 14:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n'iru Pai-hahairot, n'etiti Migdol na oké osimiri, n'iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n'akuku oké osimiri. Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n'ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime. M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a. Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n'ifè ayi? Ọ we jikere ub͕ọ-ala-ya, chiri kwa ndi-ya iso ya: o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n'elu ha nile. Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n'azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua. Ndi Ijipt we nāchu ha n'azu, bú inyinya nile nke ub͕ọ-ala nile nke Fero, na ndi-inyinya-ya, na usu-ndi-agha-ya, we rue ha aru ka ha nāma ulo-ikwū-ha n'akuku oké osimiri, n'akuku Pai-hahairot, n'iru Beal-zefon. Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova. Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta? Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara. Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi. Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.