ỌPUPU 1:1-14
ỌPUPU 1:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya. Ruben, Simiọn, Livayị na Juda; Isaka, Zebụlọn na Benjamin; Dan, na Naftalị; Gad na Asha. Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt. Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara. Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile. Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt, ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị. Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.” Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe. Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu. Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu, mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu.
ỌPUPU 1:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya. Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda; Isaka, na Zebulun, na Benjamin; Dan, na Naftali, na Gad, na Asha. Madu nile ndi si n'úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n'Ijipt. Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile. Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha. Ma eze ọhuu biliri ichi Ijipt, onye nāmaghi Josef. Ọ we si ndi-ya, Le, ndi umu Israel di ọtutu nwe kwa ume kari ayi: ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n'ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n'ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n'aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n'ala nka rigopua. Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n'isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses. Ma dika ha nēweda ha ala, otú a ka ha nāba uba, otú a ka ha nāb͕asa kwa. Ike we gwusia ha n'ihi umu Israel. Ndi Ijipt we were nkpab͕u me umu Israel ka ha fè òfùfè: ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.