ESTA 5:1-3
ESTA 5:1-3 Bible Nso (IGBOB)
O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu. O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu. Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi.
ESTA 5:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ. Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka. Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”