ESTA 4:14-16
ESTA 4:14-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?” Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị; “Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
ESTA 4:14-16 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze? Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si, Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.