ESTA 4:1-3
ESTA 4:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa. Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze. Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.
ESTA 4:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu: o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe. Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.