ESTA 1:20-22
ESTA 1:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà. Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di: o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.
ESTA 1:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.” Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru. O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.