NDI EFESỌS 6:5-8
NDI EFESỌS 6:5-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ. Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha. Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ. Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha.
NDI EFESỌS 6:5-8 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist; ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu; were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu: ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.