NDI EFESỌS 6:12-13
NDI EFESỌS 6:12-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.
NDI EFESỌS 6:12-13 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe. N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.