Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI EFESỌS 6:10-24

NDI EFESỌS 6:10-24 Bible Nso (IGBOB)

Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya. Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa. N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe. N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile. Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume, were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu; tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya. Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke: site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka, nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma, nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu. Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m'nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile: onye m'nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu. Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n'anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.

NDI EFESỌS 6:10-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu. Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu. Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu. Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile. Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume. Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna. Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.