NDI EFESỌS 5:31-33
NDI EFESỌS 5:31-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya. Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
Kesaa
Gụọ NDI EFESỌS 5NDI EFESỌS 5:31-33 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru. Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya. Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.
Kesaa
Gụọ NDI EFESỌS 5