NDI EFESỌS 5:22-33
NDI EFESỌS 5:22-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. “Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya. Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
NDI EFESỌS 5:22-33 Bible Nso (IGBOB)
Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi. N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula. Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya; ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke, ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta. Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n'anya dika ha huru aru nke onwe-ha n'anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n'anya nāhu onwe-ya n'anya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya; n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya. N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru. Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya. Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.