NDI EFESỌS 5:22-25
NDI EFESỌS 5:22-25 Bible Nso (IGBOB)
Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi. N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula. Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya
NDI EFESỌS 5:22-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.