NDI EFESỌS 4:11-14
NDI EFESỌS 4:11-14 Bible Nso (IGBOB)
Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí; ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo: rue mb͕e ayi nile gēru idi-n'otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist: ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie
NDI EFESỌS 4:11-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst. Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie.