Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI EFESỌS 2:11-22

NDI EFESỌS 2:11-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie). Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri. Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ. Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.

NDI EFESỌS 2:11-22 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi nka chetanu, na n'oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n'anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n'anu-aru, nke eji aka me; na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa. Ma ub͕u a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n'ebe di anya n'oge gara aga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist. N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige, ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di; ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya: O we bia zì unu ndi nọ n'ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo: n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ. Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n'ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n'ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke, ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya; ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n'ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi; Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.