NDI EFESỌS 1:3-5
NDI EFESỌS 1:3-5 Bible Nso (IGBOB)
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist: dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya: ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya
NDI EFESỌS 1:3-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.