NDI EFESỌS 1:11-19
NDI EFESỌS 1:11-19 Bible Nso (IGBOB)
Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di; ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu: Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà, bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya. N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem; ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya; ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya, mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di
NDI EFESỌS 1:11-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya. Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya. Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya. Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ, esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile. Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ, ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ. Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.