NDI EFESỌS 1:1-6
NDI EFESỌS 1:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
NDI EFESỌS 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n'Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bu Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist: dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya: ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya, ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya