EKLISIASTIS 9:13-18
EKLISIASTIS 9:13-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe. Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu. Amamihe ka ihe agha niile mma, ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.
EKLISIASTIS 9:13-18 Bible Nso (IGBOB)
Otú a kwa ka m'huworo amam-ihe n'okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum: otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya: ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n'amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye. Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile. Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu. Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n'iyì.