Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EKLISIASTIS 9:1-18

EKLISIASTIS 9:1-18 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha. Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi. Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu. N'ihi na onye ọ bula nke ejikọtaworo ya na ndi nile di ndu, o nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọ diri nkita di ndu nma kari ọdum nwuru anwu. N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha. Ma ihu-n'anya-ha, ma ikpọ-asì-ha, ma ekworo-ha, na mb͕e di anya gara aga ka ọ laworo n'iyì; ọ dighi kwa òkè ha nwere ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi n'ihe ọ bula nke emeworo n'okpuru anyanwu. Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga. Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi. Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu. Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla. M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile. N'ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n'ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n'ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n'ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede. Otú a kwa ka m'huworo amam-ihe n'okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum: otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya: ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n'amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye. Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile. Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu. Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n'iyì.

EKLISIASTIS 9:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị. Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja. Dịka ọ dịrị ezi mmadụ, otu a ka ọ dịrị onye mmehie; dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi, otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ. Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ. Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ. Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu. Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. Ha agaghị enwekwa oke nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ. Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị. Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị. Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru: Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya, maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ. Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ mgbe ha na-atụghị anya ya. Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe. Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu. Amamihe ka ihe agha niile mma, ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.