EKLISIASTIS 8:1-17
EKLISIASTIS 8:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye dị ka onye amamihe? Onye maara nkọwa ihe? Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee. Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke. Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya. Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme? Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe. Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya. Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime? Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu. Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu. Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie. Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke. Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo. Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi. Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ. Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị, mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.
EKLISIASTIS 8:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa. Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke. Esila n'iru ya pua ọsọsọ; eguzola n'ihe ọjọ: n'ihi na ihe ọ bula nke nātọ ya utọ ka ọ nēme. N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme? Onye nēdebe ihe enyere n'iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata. N'ihi na ihe ọ bula anēme eme nwere mb͕e na ikpé; n'ihi na ọnọdu ọjọ madu riri nne n'aru ya: n'ihi na ọ dighi-ama ihe gādi adi; n'ihi na ònye gēgosi ya otú ọ gādi? Ọ dighi madu ọ bula nwere ike n'aru mọ ib͕ochi mọ; ọ dighi kwa ike o nwere n'aru ubọchi ọnwu; ọ dighi kwa nzilaga di n'agha ahu: nmebi-iwu agaghi-eme ka onye-nwe-ya wepuga onwe-ya. Ihe nile a ka m'huworo, m'we nye obim ilu ọlu ọ bula nke aluworo n'okpuru anyanwu: mb͕e di mb͕e otù madu nwere ike n'aru madu-ibe-ya imejọ ya. N'uzọ di otú a m'hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n'ílì; ha we si n'ebe nsọ la, ewe chezọ ha n'obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu. N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ. Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya: ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke. Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu. Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu. Mb͕e m'were obim nye ima amam-ihe, na ihu nweda-n'ala nke anēme n'elu uwa: (n'ihi na madu di kwa nke nādighi-ahu urá n'anya-ya abua ma ọ bu n'ehihie ma-ọbu n'abali:) m'we hu ọlu nile nke Chineke, na madu apughi ichọputa ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ọ buru na madu adọb͕u onwe-ya n'ọlu n'uzọ nile ichọ ya, ma ọ gaghi-achọputa ya; ọzọ kwa, ọ buru na onye mara ihe asi na ọ gāma ya, ọ pughi ichọputa ya.