EKLISIASTIS 5:1-7
EKLISIASTIS 5:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ. Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị? Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.
EKLISIASTIS 5:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n'ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n'ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ. Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole. N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu. Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya. Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, kari ikwe nkwa ma i dighi-akwughachi. Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n'iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n'amaghi-ama ka emere ya: n'ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua? N'ihi na n'ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke.