EKLISIASTIS 4:9-12
EKLISIASTIS 4:9-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
EKLISIASTIS 4:9-12 Bible Nso (IGBOB)
Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu. N'ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie. Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku? Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.