EKLISIASTIS 3:1-6
EKLISIASTIS 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n'okpuru elu-igwe: mb͕e imu nwa, na mb͕e inwu anwu; mb͕e iku ihe n'ubi, na mb͕e iropu ihe akuru; mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo; mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú; mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n'ebe di anya; mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n'iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu
EKLISIASTIS 3:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe. Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu, oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi, oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu, oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ, oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi