Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EKLISIASTIS 2:17-26

EKLISIASTIS 2:17-26 Bible Nso (IGBOB)

M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe. Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri. Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu. Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m'dọb͕ururi onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu. N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne. N'ihi na gini ka madu nwere na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na nime ncheb͕u nke obi-ya, nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu? N'ihi na ubọchi-ya nile bu nání ihe-nb͕u, nkpasu-iwe ka nweda-n'ala-ya bu kwa; ọbuná n'abali obi-ya edinaghi iraru ura. Nka bu kwa ihe-efu. Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere. N'ihi na ònye nēri ihe, ma-ọbu ònye nēme ngwa iri ihe karim? N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

EKLISIASTIS 2:17-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe. Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m. Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu. Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị. Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu. Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke? Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.