EKLISIASTIS 12:12-14
EKLISIASTIS 12:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike. Ugbu a anụla ihe ndị a niile, ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.
Kesaa
Gụọ EKLISIASTIS 12EKLISIASTIS 12:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Tukwasi kwa n'ihe ndia, nwam, nara ndum-ọdu: ime ọtutu akwukwọ enweghi ọgwugwu; ọtutu nmuta bu kwa ike-ọgwugwu nke anu-aru. Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n'iwu; n'ihi na nka bu ọlu madu nile. N'ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n'ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.
Kesaa
Gụọ EKLISIASTIS 12