EKLISIASTIS 11:7-10
EKLISIASTIS 11:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Ọzọ, ìhè di utọ, ọ di-kwa-ra anya abua nma ihu anyanwu. E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n'ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu. Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé. Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.
EKLISIASTIS 11:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ. Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu. Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere. Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.