EKLISIASTIS 11:3-6
EKLISIASTIS 11:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru na igwe-oji ejuputa na miri-ozuzo, n'ala ka ha nāwusa onwe-ha: ọ buru kwa na osisi ada na Ndida, ma-ọbu n'Ugwu, n'ebe osisi ahu nāda, n'ebe ahu ka ọ gādigide. Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi. Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile. Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu.
EKLISIASTIS 11:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ. Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi. Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile. Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.