EKLISIASTIS 11:1-10
EKLISIASTIS 11:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị. Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo. Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ. Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi. Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile. Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma. Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ. Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu. Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere. Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
EKLISIASTIS 11:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Zipu nri-gi n'elu miri: n'ihi na mb͕e ọtutu ubọchi gasiri i gāhu ya. Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n'ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n'uwa. Ọ buru na igwe-oji ejuputa na miri-ozuzo, n'ala ka ha nāwusa onwe-ha: ọ buru kwa na osisi ada na Ndida, ma-ọbu n'Ugwu, n'ebe osisi ahu nāda, n'ebe ahu ka ọ gādigide. Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi. Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile. Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu. Ọzọ, ìhè di utọ, ọ di-kwa-ra anya abua nma ihu anyanwu. E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n'ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu. Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé. Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.