Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 8:1-18

DEUTERONOMI 8:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ ONYENWE ANYị kwere nna nna gị ha na nkwa. Chetakwa otu ONYENWE ANYị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya. E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ ONYENWE ANYị pụta. Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza. Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka ONYENWE ANYị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị. Debe iwu ONYENWE ANYị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu, ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ. Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile. Mgbe i riri rijuo afọ, too ONYENWE ANYị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị. Ma lezie anya ka ị ghara ichefu ONYENWE ANYị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa. Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha, mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara. Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo ONYENWE ANYị Chineke gị onye mere ka ị site nʼIjipt, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta. Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma. I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.” Ma cheta ONYENWE ANYị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa.

DEUTERONOMI 8:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, unu gēlezi anya ime ya, ka unu we di ndu, ba uba, we ba nime, nweta kwa ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha. I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe. O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu. Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia. I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti. I gēdebe kwa ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ka i we je ije n'uzọ-Ya nile, tu kwa egwu Ya. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, bú ala iyi miri, na nke isi-iyi na ob͕u-miri, nāputa na ndagwurugwu na n'ugwu: ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive nēnye manu, na nke manu-aṅu; ala nke ọ bughi n'idi-ukọ ka i gēri nri nime ya, ọ dighi ihe ọ bula gākọ gi nime ya; ala nke nkume-ya bu ígwè, nke i gēgwuputa kwa ọla n'ugwu-ya. I gēri kwa, afọ gēju kwa gi, i gāgọzi kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'elu ezi ala ahu nke O nyeworo gi. Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta: ka o we ghara ibu, mb͕e i nēri ihe, riju afọ, wu kwa ezi ulo, we biri nime ha: mb͕e ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba kwa uba, mb͕e ọla-ọcha na ọla-edo nāba-kwa-ra gi uba, mb͕e ihe nile i nwere nāba kwa uba; na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta; Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi; Onye nēme ka i rie manna n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi; ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa kwa gi, ime gi nma n'ikpe-azu-gi: i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a. Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.