DEUTERONOMI 7:1-6
DEUTERONOMI 7:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu; mgbe ONYENWE ANYị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere. Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom. Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe ONYENWE ANYị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa. Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ. Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye ONYENWE ANYị bụ Chineke unu. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
DEUTERONOMI 7:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi; mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara: gi na ha alurita-kwa-la nwunye; enyela nwa-ya nwoke nwa-gi nwayi, ekuru-kwa-la nwa-ya nwayi nye nwa-gi nwoke. N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa. Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.