DEUTERONOMI 31:1-6
DEUTERONOMI 31:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile, ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na ONYENWE ANYị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan. ONYENWE ANYị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka ONYENWE ANYị kwuru. ONYENWE ANYị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha. ONYENWE ANYị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu. Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
DEUTERONOMI 31:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Moses we je gwa Israel nile okwu ndia. Ọ we si ha, Ọgu arọ isi ka m'b͕ara ta; apughm ipu apu na ibata abata ọzọ: Jehova asiwokwam, I gaghi-agabiga Jọdan nka. Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, Ya onwe-ya gēkpochapu mba ndia n'iru gi, i gēnweta kwa ha: Joshua, ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, dika Jehova kwuworo. Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru. Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu. Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.