DEUTERONOMI 3:21-29
DEUTERONOMI 3:21-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe ONYENWE ANYị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga. Atụla ha egwu, nʼihi ONYENWE ANYị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.” Nʼoge ahụ, arịrịọ m ONYENWE ANYị arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ. Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.” Ma nʼihi unu, ONYENWE ANYị wesoro m iwe jụ ige m ntị! ONYENWE ANYị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a. Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan. Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.” Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.
DEUTERONOMI 3:21-29 Bible Nso (IGBOB)
Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga. Unu atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha. M'we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si, Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di? Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon. Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli. Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka. Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu. Ayi we nọdu na ndagwurugwu na ncherita-iru Bet-peoa.