DEUTERONOMI 28:6-13
DEUTERONOMI 28:6-13 Bible Nso (IGBOB)
Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu na nbata-gi, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọpupu-gi. Jehova gēme ka etib͕ue n'iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n'otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n'uzọ asa ka ha gāb͕alaga n'iru gi. Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, mb͕e i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile. Ndi nile nke uwa gāhu kwa na ọ bu aha Jehova ka anākpọkwasi gi; ha gātu kwa egwu gi. Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi. Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe. Jehova gēme kwa gi isi, ọ bughi ọdudu; i gādi nání n'elu, i gaghi-adi kwa n'okpuru; mb͕e i gēge nti ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, idebe na ime ha
DEUTERONOMI 28:6-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ. ONYENWE ANYị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga. ONYENWE ANYị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. ONYENWE ANYị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị. ONYENWE ANYị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu ONYENWE ANYị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile. Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha ONYENWE ANYị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu. ONYENWE ANYị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. ONYENWE ANYị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. ONYENWE ANYị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.