Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 23:1-25

DEUTERONOMI 23:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYị. Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYị. Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha. Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ. Ma ONYENWE ANYị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama ONYENWE ANYị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị hụrụ gị nʼanya. Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi. Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha. Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke ONYENWE ANYị. Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha. Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị. Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ. Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. ONYENWE ANYị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị. Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi, hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya. Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị. Ị gaghị ewebata nʼụlọ ONYENWE ANYị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ONYENWE ANYị Chineke gị. A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa. Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka ONYENWE ANYị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta. Mgbe i kwere ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya. Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla! Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye ONYENWE ANYị Chineke gị. Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị. Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.

DEUTERONOMI 23:1-25 Bible Nso (IGBOB)

Onye emetara ọnyá site n'ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova. Nwa-iko agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova; ọbuná ọb͕ọ nke-iri ya agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova. Onye Amon ma-ọbu onye Moab agaghi-abà nime kpọkọta Jehova, ọbuna ọb͕ọ nke-iri ha agaghi-abà nime kpọkọta Jehova rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi. Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n'anya. Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi. Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya. Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova. Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula. Mb͕e nwoke ọ bula di n'etiti unu, nke nādighi ọcha, site n'ihe mere ya n'abali, ọ gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n'etiti ọmuma-ulo-ikwū: ma ọ gēru, mb͕e ọ nēru anyasi, na ọ gēwere miri sa aru-ya: mb͕e anyanwu nāda, ọ gābà kwa n'etiti ọmuma-ulo-ikwū. I gēnwe kwa otù ebe n'azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n'ọgwe: i gēnwe kwa osekè n'etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n'ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n'aru-gi puta: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n'iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n'etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n'iso gi n'azu. Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n'aka onye-nwe-ya b͕akute gi: ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike. Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel. Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa. Ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma; bú uma nke ego, ma-ọbu uma nke ihe-oriri, ma-ọbu uma nke ihe ọ bula nke anēbinye n'uma: onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya. Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi. Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi. Ihe nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n'ọnu-gi. Mb͕e ọ bula i nābà n'ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n'ihe-gi. Mb͕e ọ bula i nābà n'ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi, i gāghọrọ oko ọka n'aka-gi; ma ewegharila mma-iwe-ihe-ubi n'elu ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi.