DEUTERONOMI 20:16-18
DEUTERONOMI 20:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa. N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu: ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.
DEUTERONOMI 20:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ ONYENWE ANYị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi. Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka ONYENWE ANYị Chineke gị nyere gị nʼiwu. Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide ONYENWE ANYị Chineke gị.