DEUTERONOMI 16:18-22
DEUTERONOMI 16:18-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile. Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị. Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye ONYENWE ANYị Chineke gị. Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe ONYENWE ANYị Chineke gị kpọrọ asị.
DEUTERONOMI 16:18-22 Bible Nso (IGBOB)
I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume. Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ. Ezi omume, ezi omume ka i gāb͕aso, ka i we di ndu, we nweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. Akurula onwe-gi Ashera nke osisi ọ bula n'akuku ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, nke i gēmere onwe-gi. Eguzoro-kwa-la onwe-gi ogidi; nke Jehova, bú Chineke-gi, nākpọ asì.