Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 16:1-17

DEUTERONOMI 16:1-17 Bible Nso (IGBOB)

Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n'ihi na ọ bu n'ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n'Ijipt puta n'abali. I gāchu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà ngabiga, nke ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'ebe ahu nke Jehova gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi. Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu. I pughi ichu àjà ngabiga n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi: kama n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n'ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n'anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n'Ijipt puta. I gēsi kwa ya rie ya n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n'ututu, je n'ulo-ikwu-gi nile. Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya. Izù asa nke ubọchi asa ka i gāguru onwe-gi: site na mb͕e i nāmalite itiye mma-iwe-ihe-ubi nime ọka guzoro eguzo ka i gāmalite igu izù asa nke ubọchi asa. I gēme-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe nke izù asa nke ubọchi asa, dika ọtùtù nke onyinye-afọ-ofufo nke aka-gi si di, nke i gēnye, dika Jehova, bú Chineke-gi, nāgọzi gi: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'Ijipt: i gēdebe kwa me kwa ukpuru ndia. I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n'ebe-nzọcha-ọka-gi na n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi: i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile. Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu. Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu: nwoke ọ bula dika onyinye aka-ya si di, dika ngọzi Jehova, bú Chineke-gi, si di, nke O nyeworo gi.

DEUTERONOMI 16:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka ONYENWE ANYị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị. Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ ONYENWE ANYị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ ONYENWE ANYị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya. Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ. Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ. Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla ONYENWE ANYị Chineke gị nyere gị, karịakwa nʼebe ahụ ONYENWE ANYị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta. Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ ONYENWE ANYị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị. Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye ONYENWE ANYị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla. Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị. Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye ONYENWE ANYị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị ONYENWE ANYị bụ Chineke gị ji gọzie gị. Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu ONYENWE ANYị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya. Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a. Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile. A ga-eme mmemme a nye ONYENWE ANYị Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ ONYENWE ANYị nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke. Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu ONYENWE ANYị. Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka ONYENWE ANYị Chineke gị sị gọzie ya.