DEUTERONOMI 11:24-25
DEUTERONOMI 11:24-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu. Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.
Kesaa
Gụọ DEUTERONOMI 11DEUTERONOMI 11:24-25 Bible Nso (IGBOB)
Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu. Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.
Kesaa
Gụọ DEUTERONOMI 11