DEUTERONOMI 10:12-14
DEUTERONOMI 10:12-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, Izrel, gịnị ka ONYENWE ANYị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu ONYENWE ANYị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ ONYENWE ANYị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị. Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke ONYENWE ANYị Chineke gị.
DEUTERONOMI 10:12-14 Bible Nso (IGBOB)
Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè, idebe ihe nile Jehova nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta ka ọ we diri gi nma? Le, Jehova, bú Chineke-gi, nwe elu-igwe, na elu-igwe nke elu-igwe nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya.